Okwu nke Ụbọchị

Okwu nke Ụbọchị
October 16, 2026

Ebubo 63-0707M

Olee otu ha si boro Ya ebubo? N’ihi na okwukwe ha agaghị anabata Ya, ha makwa ihe dị iche n’obi ha. Nikọdimọs, n’isi nke atọ nke Saint Jọn, ọ bụghị ya kwuru nke ọma? “Rabaị, anyị, ndị Farisii,” ndị nkwusa, ndị nkuzi, “anyị maara na Ị bụ onye ozizi e zitere site na Chineke, n’ihi na ọ dịghị onye pụrụ ime ihe ndị Ị na-eme ma ọ bụrụ na Chineke anọnyereghị Ya.” Lee? Ha hụrụ ya n’ihu ọha site n’aka otu n’ime ndị a ma ama ha, ha wee sie ya… n’ihi okwukwe ha, ha kpọgidere Kraịst n’obe.

Taa, ọ dịghị onye na-agụ akwụkwọ nke na-enweghị ike ịgụ Ọrụ Ndịozi 2:38 otu m si agụ ya, na ihe ndị ọzọ dị na ya, dịka m si agụ ya. Ma n’ihi okwukwe ha, na n’ihi tiketi okpukpe ha nke ha tinyere n’akpa ha, akara nke anụ ọhịa ahụ ha na-akwakọba dị ka kaadị mkpakọrịta; ha na-ewerekwa ihe ndị ahụ, ha kpọgidere Jizọs Kraịst n’obe ọzọ, ma kpọgide Ya n’obe n’ihu ọha, ma na-ekwulu Chineke ahụ nke kwere nkwa ime nke a, na-eweta ikpe n’ahụ agbụrụ ahụ.

Achịcha Kwa Ụbọchị
Ọ bịakwutere ndị nke Ya, ndị nke Ya anabataghịkwa Ya.
Jọn 1:11

An Independent Church of the WORD,