Okwu nke Ụbọchị
October 19, 2026
Iso Ụzọ Kraịst na Ikpere Arụsị 61-1217
…Anyị bụ onyinyo dị ndụ nke Chineke dị ndụ. Mgbe ahụ, nwụrụ anwụ nye onwe onye, a kpọlitere ya na Ya, gee ntị ugbu a, gee ntị na nke a, Okwu Ya mere anụ ahụ ọzọ n’ime anyị. (Oh, Nwanna Neville!) Lee! Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụghị chi akụkọ ifo, nke a na-eche n’echiche nọdụrụ n’ebe ahụ, kama Chineke dị ndụ. Gịnị bụ Chineke dị ndụ? Okwu dị n’ime gị na-eme ka onwe ya bụrụ eziokwu. Lee! Otuto dịrị Chineke! Oh, ama m na ị chere na m bụ onye nsọ, ikekwe abụ m. Ma, oh, nwanne m, ị na-ahụ ya? Mmeri n’elu okpukpe niile, Nmeri n’elu ikpere arụsị niile, Chineke dị ndụ nke a na-ekpughe n’ụlọ nsọ dị ndụ, Okwu Chineke, nke bụ Chineke, aghọọla anụ ahụ n’ime unu. Gịnị mere? Unu nọdụrụ n’ebe dị n’eluigwe, emeriela ihe niile, n’ime Kraịst Jizọs. Amen!
Achịcha Kwa Ụbọchị
Ùnu amaghị na ahụ unu bụ akụkụ nke Kraịst?
1 Ndị Kọrịnt 6:15