Okwu nke Ụbọchị
October 15, 2026
Okwukwe Bụ Ihe Dị Adị (Faith Is The Substance) 51-0508
Ahụ́ anyị na-asụ ude, anyị nwekwara ihe nketa. Anyị bụkwa ụmụaka ugbu a, ndị ga-eketa Alaeze ahụ (Lee ihe dị ebube!), ndị eze na ndị nchụàjà nye Chineke, na-eweta àjà nke mmụọ.
Gịnị ka onye nchụàjà na-eme? Ọ na-eweta àjà. Gịnị bụ àjà—àjà nke mmụọ? Nke ahụ bụ ihe ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ndị a na-eme—ndị bụ ndị eze na ndị nchụàjà—n’agbanyeghị na ha enwetabeghị ihe niile ha ga-enweta, ha na-eweta àjà, na-enye Chineke àjà nke mmụọ: mkpụrụ nke egbugbere ọnụ anyị na-eto Ya (Amen), mkpụrụ nke egbugbere ọnụ anyị.
Ị na-asị, “Nwanna Branham, ọ dịghị m ka m na-eto Ya.” Nke ahụ bụ oge kwesịrị ekwesị iji wepụta àjà ahụ. Too Ya n’agbanyeghị ọnọdụ ahụ. Ndị eze na ndị nchụàjà, ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị na-eweta àjà nke mmụọ, mkpụrụ nke egbugbere ọnụ anyị, na-eto Aha Ya.
Nri nke Ụbọchị
Too Onyenwe anyị, unu mba niile: too Ya, unu ndị niile.
Abụ Ọma 117:1