Okwu nke Ụbọchị
October 4, 2026
Echere na 62-0117
Otu onye kwuru, n’ụbọchị gara aga, sị, “Nwanne Branham, ndị mmadụ na-ewere gị dị ka onye amụma. Gịnị mere na ị naghị akụziri ndị ahụ otu esi enweta onyinye ime mmụọ? Hapụ uwe ha na-eyi na ndị ikom ahụ na-eme. Hapụ ya. Ị nweghị ọrụ ikwu ya. Kụziere ha ihe ime mmụọ dị ukwuu, miri emi,.”
Asịrị m, “Kedu ka m ga-esi kụziere ha algebra, ebe ha amaghị ABC?” Kedu ka ị ga-esi nye ha agụmakwụkwọ mahadum; ha anọghịkwa na ụlọ akwụkwọ ọta akara? Ị nweghịkwa omume ọma iji sachaa onwe gị ma mee omume dị ka Ndị Kraịst, na-eyi uwe dị ka Ndị Kraịst, na-ebi ndụ dị ka Ndị Kraịst, wee kwuo maka onyinye ime mmụọ. Pụta na ụlọ akwụkwọ ọta akara. Ha chere na nke ahụ dị mma, mana ọ dị njọ. Ịkwesighi ime ya. Ndị nne unu emeghị ya, nke ahụ bụ na Pentekọst afọ gara aga. Mana ha na-eme ya.
Unu ndị ikom, kedu ka unu si guzo, kwe ka nwunye unu mee nke ahụ? Unu ka nọ na ụlọ akwụkwọ ọta akara. Ị̀ hụla? Nke ahụ ziri ezi. I chere na ihe niile dị mma, mana ọ dịghị mma.
Achịcha Kwa Ụbọchị
… na-akpa àgwà dịka o kwesịrị ịdị nsọ.
Taịtọs 2:3