Okwu nke Ụbọchị

Okwu nke Ụbọchị
August 14, 2026

Ebe Chineke Họpụtara Maka Ofufe 65-0220

Mara, nchekwa dị naanị n’ebe Ọ họọrọ, n’ime atụrụ Ya, na n’aha atụrụ Ya.

Mara, O bụ atụrụ “nwoke Nke nwoke”, ọ bụghị nwanyi, Ọ bụghị Uka, nwanyi; kama Aha Ya, ọ bụghị aha nwanyi . Ebe Ọ na-aga izute ndị mmadụ abụghị n’aha nwanyi , kama n’aha Ya, Ya, Nwa Atụrụ!

Ugbu a anyị na-ekwu, ” ụka ahu, nnukwu ụka, dị ike, o mere nke a, o mekwara nke ahụ. Ọ tụlewo oké ifufe Anyị amụbaala n’ọnụọgụgụ. Anyị dị ukwuu n’ọnụọgụgụ. Anyị bụ ụka, dị ike. Ọ bụ ihe dị ukwuu.”

Ma Chineke ekwughị ihe ọ bụla gbasara nwanyị. Ọ sịrị, “Ya.” “Ya,” bụ ebe nzukọ, Nwa Atụrụ ahụ, ọ bụghị ụka, ahụ. Ọ bụghị aha nwanyi a, kama Aha Ya. O tinyeghị aha nwanyi a ebe ọ bụla. O tinyere Aha Ya n’ime “Ya”!

Ọ bụ ya mere, “Ihe niile anyị ga-eme, ma ọ bụ okwu ma ọ bụ omume, anyị ga-eme ya niile n’aha Jizọs Kraịst.” Ọ bụrụ na anyị ekpee ekpere, anyị ga-ekpe ekpere n’aha Jizọs. Ọ bụrụ na anyị arịọ arịrịọ, anyị ga-arịọ n’aha Jizọs. Ọ bụrụ na anyị ejee ije, anyị ga-eje ije n’aha Jizọs. Ọ bụrụ na anyị ekwurịta okwu, anyị ga-ekwu okwu n’aha Jizọs. Ọ bụrụ na anyị emee baptism, anyị ga-eme baptism n’aha Jizọs Kraịst. N’ihi na, “Ihe niile anyị na-eme n’okwu ma ọ bụ n’omume, mee ya n’aha Jizọs Kraịst.”

Achịcha Kwa Ụbọchị
Ihe ọ bụla unu na-eme n’okwu ma ọ bụ n’omume, mee ihe niile n’aha Onyenwe anyị Jizọs, na-ekele Chineke na Nna site n’aka Ya.
Ndị Kọlọsi 3:17

An Independent Church of the WORD,