Okwu nke Ụbọchị
April 22, 2026
Akara nke Anụ ọhịa ahụ na Akara nke Chineke 61-0216
Jizọs bịara, mee ihe ịrịba ama nke Mesaịa ahụ, gosi na Ọ bụ Mesaịa ahụ, mgbe Ọ pụrụ”Ọ kwagara onwe ya n’Ebube, zighachi Mmụọ Nsọ, ma tee ndịozi mmanụ, ha wee pụọ na-eme ihe ịrịba ama ndị ahụ O mere.
Ha nwere ike nke Onyenwe anyị. Ha kwuru okwu n’asụsụ dị iche iche, ha tiri mkpu, e nwere oké ifufe na-efe efe jupụtara ha, ha wee pụọ n’oké ịnụ ọkụ n’obi ruo mgbe ha jiri Mmụọ Nsọ gbaa obodo ndị ahụ ọkụ. Gịnịkwa ka ha mere? Ha chịrị ha ọchị, ha chịrị ha ọchị. Nke ahụ ziri ezi. Jizọs kwuru, sị, “Unu na-ekwu okwu megide m, m ga-agbaghara unu. Ma mgbe Mmụọ Nsọ ga-abịa, a gaghị agbaghara otu okwu megide Ya.” Ha mekwara ebe ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi mgbe ha na-akwa ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ emo.
Achịcha Kwa Ụbọchị
Ma mmadụ nke anụ ahụ anaghị anabata ihe nke Mmụọ Chineke: n’ihi na ha bụ ihe nzuzu nye ya: ọ pụghịkwa ịma ha, n’ihi na a na-aghọta ha n’ụzọ ime mmụọ.
1 Ndị Kọrịnt 2:14″