Okwu nke Ụbọchị
August 7, 2026
Site n’oge ahụ 60-0302
Ihe na-agbanwe mgbe mmadụ zutere Chineke.
Mmadụ enweghị ike izute Chineke ma ọ bụ bụrụ otu onye ọzọ, ị ga-abụ onye ka mma ma ọ bụ onye ka njọ. Ị ga-aka mma, ma ọ bụ ka njọ mgbe ị zutere Chineke, ọ dabere n’ihe ịchọrọ ime gbasara ya. Mana mmadụ enweghị ike izute Chineke ma bụrụ otu onye ahụ.
Ihe ọ bụla ị na-eche banyere Chineke, na-emechi ebe ị na-aga mgbe ebighị ebi. Ị nwere ike ịgafe ókè dị n’etiti amara, ebere, na ikpe, mgbe ị jụrụ amara ọtụtụ ugboro ị nwere ike ikewapụ onwe gị na ọnụnọ nke Chineke, ma ọ bụ ị nwere ike ịnakwere Ya ma nweta Ndụ Ebighị Ebi, ma ghara ịnwụ anwụ, kama a ga-akpọlite gị ọzọ n’ụbọchị ikpeazụ na mbilite n’ọnwụ izugbe.
Achịcha Kwa Ụbọchị
N’ihi na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ; ma onyinye Chineke bụ ndụ ebighị ebi site na Jizọs Kraịst Onyenwe anyị.
Ndị Rom 6:23