Okwu nke Ụbọchị
August 4, 2026
Izrel na Chọọchị #3 53-0327
N’ogige Iden, mgbe mmadụ ghọtara na o mehiere, ọ gbalịrị ime onwe ya okpukpe, ihe mkpuchi. Okwu ahụ bụ okpukpe pụtara “ikpuchi.” Adam na Iv dụkọtara akwụkwọ osisi fig ọnụ, wee mee onwe ha okpukpe. Kemgbe ahụ, ọ bụ ihe siri ike nke mmadụ kemgbe ụwa, na-agbalị ime ihe iji zọpụta onwe ya.
Ma a zọpụtara gị site n’amara, nhọpụta, ihe ọmụma Chineke, ihe a kara aka, nhazi ya tupu oge eru .Pọl gwara chọọchị dị na Efesọs, na, “Chineke ekpebiela anyị n’ime Kraịst tupu e tọọ ntọala ụwa.” Chee echiche banyere ya! “akara anyị aka n’ime Kraịst tupu e tọọ ntọala ụwa.”Kedu ihe anyị na-echegbu onwe anyị mgbe ahụ? Wepụnụ onwe unu na nchegbu ,anyị bu nọọ ndị kacha nwee obi ụtọ ị hụtụrụla. M! kedu ka unu ga-esi kwere nke ahụ ma ghara inwe obi ụtọ?
Achịcha Kwa Ụbọchị
Ndị a họpụtara dịka ihe Chineke Nna mara tupu oge eruo, site na nsọ nke Mmụọ Nsọ, ka nrubeisi na ifesa ọbara Jizọs Kraịst:
1 Pita 1:2