Okwu nke Ụbọchị

Okwu nke Ụbọchị
August 2, 2026

Ọrụ Ebube nke Abụọ 51-0729E

Jụ ịbịanye aka maka ihe ọ bụla ekwensu wetara. Ọ ga-eweghachi ya. Kwuo, “Ajụrụ m inwe ya. Agaghị m enweta ya, mba, nna m ukwu.” Ọ ga-eweghachi ya n’aha Onyenwe anyị. Ọ bụrụ na i kwere ya, ma kwupụta ya, ma sị, “Ana m anabata Jizọs Kraịst dị ka Onye Na-agwọ m,” ọ dịghị nsogbu ma ọ bụ ọrịa nwere ike ịnọnyere gị. Nọgide na ya.

Mana oge mbụ ị dara mbà wee sị, “Ee, ee, ka nwere ya.” Mgbe ahụ ị ga-ada ozugbo n’ebe ị nọ. Ị bịanyere aka maka ya, wee weghachite ya. Kwuo, “Ee, Maazị Ekwensu, m—m ga-enweta ya ọzọ.” Oh, nwanne m nwoke.

Ị guzoro kpọmkwem ebe ahụ dịka—ma ọ bụrụhaala na e nwere ume n’ahụ gị, sị, “Ajụrụ m inwe ya. Ajụrụ m inwe ya.” Kedu ka ị na-eche? “Ọ dị ebube, hallelujah.” Ọ bụ ya. Ọ dị mma. Gosi ekwensu ihe e ji mee gị; a mụrụ gị ọzọ site na Mmụọ Chineke, ịkwesighikwa ịkpọ isiala nye onyinyo ya. Nọrọ ebe ahụ, sị, “Achọghị m ihe gị.”

“Lee aha gị n’elu ya, dọkịta kwuru…”

“Achọghị m ihe o kwuru. Amaara m ihe Chineke kwuru. Si ebe a pụọ na ya.”

Ọ dị mma, nke ahụ bụ ụzọ isi gwọọ ya; nyeghachi ya. Ọ bụ ya nyere gị ya, ọ ga-abụrịrị onye ga-anara ya.

Achịcha Kwa Ụbọchị
Ya mere, doo onwe gị n’okpuru Chineke. Guzogide ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ. Jemes 4:7

An Independent Church of the WORD,