Okwu nke Ụbọchị
July 9, 2026
Nụrụnụ Ya 58-0126
Ọ bụ ihe na-ezighị ezi ka nwanyị kpụọ isi ya. Baịbụl kwuru otú ahụ. Ọ na-eme di ya ihere mgbe ọ na-eme ya. Chọọchị anaghịkwa eme nke ahụ, mana taa, n’ihi na ikpo okwu adịghị ike, ha na-eme ya. Ụmụ nwanyị na-eyi uwe ndị a dị ntakịrị nke yiri uwe nwoke, uwe ogologo, ma ọ bụ ihe ọzọ, ka ha na-akpọ ha. Ị maara na Baịbụl kwuru na nke ahụ bụ ihe rụrụ arụ na ihe arụ n’anya Chineke. Gịnị ka Mmụọ Nsọ na-eche mgbe Ọ na-eweta nke ahụ n’ihu Chineke Nna, otú ụmụ nwanyị nke Chọọchị si eme?
Achịcha Kwa Ụbọchị
Ma ọ bụrụ na nwanyị nwere ogologo ntutu isi, ọ bụ otuto nye ya: n’ihi na enyere ya ntutu isi ya maka ihe mkpuchi.
1 Ndị Kọrịnt 11:15