Okwu nke Ụbọchị
April 16, 2026
Ikwere nke a 51-1003
Jizọs bụ Onyeisi Nchụàjà nke nkwupụta gị. Ihe ọ bụla ị kwupụtara na Ọ na-eme, Ọ ga-eme. Ị…
Ọtụtụ mmadụ na-ele ihe mgbaàmà anya. Ị na-asị, “Nke oma Nwanna Branham, aka m adịghị eguzo ọtọ.” Ọ gaghị adi ebe I na eleya anya oge nile . Anyị anaghị ele anya na nke ahụ; anyị na-ele anya na nkwa Chineke.
Kwuo maka ihe mgbaàmà, lee Jona, n’ime afọ whale. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ike inwe ihe mgbaàmà, ọ nwere ha: daghachi azụ ; aka e kegidere n’azụ ya; n’oké osimiri, oké ifufe bịara; tụba ya; whale loro ya, gaa n’ala oké osimiri. Azụ ọ bụla, mgbe ọ gbutere-… mgbe ọ na-eri nri, ọ na-aga ma debe nku ya—nku n’ala oké osimiri. Ọ nọkwa ebe ahụ afo ya juru na onye nkwusa ozioma daghachiri azu , dina n’akụkụ mmiri,… n’okpuru oké osimiri, oké ifufe n’oké osimiri. Daghachi azu , lee ọnọdụ ọ nọ. Ọ lere anya n’ụzọ dị otu a, ọ bụ afọ whale; O Lere anya na ụzọ nke ahu, ọ bụ afọ whale; ebe ọ bụla ọ lere anya, ọ bụ afọ whale. Ị maara ihe o kwuru? Ọ sịrị, “Anaghị m ele afọ whale ahụ anya.” Ọ sịrị, “Ha bụ ihe efu ụgha.” O kwuru, sị, “Onyenwe anyị, m na-elegharị anya n’ụlọ nsọ gị ọzọ.” Hallelujah. Ọ hụghị afọ whale, ọ hụrụ ụlọ nsọ Chineke.
Achịcha Kwa Ụbọchị
Ndị na-ele ihe efu ụgha anya na-ahapụ ebere nke ha.
Jonah 2:8″