Okwu nke Ụbọchị
April 13, 2026
N’ihu Ya 62-0909E
Ọ bụrụ na anyị ekwupụta na Ọ dị, anyị nọ n’Ọnụnọ Ya, anyị ekwupụtakwala mmehie anyị, a ga-ehichapụ ha n’akwụkwọ ncheta Ya. Ọ dịghị onye ọzọ ma e wezụga Chineke nwere ike ime nke ahụ. Ugbu a, ị nwere ike ime ihe ọ bụla nye m, m ga-agbaghara gị, mana m ga-echeta ya. Ọ bụrụ na m mee gị ihe ọ bụla, ị ga-agbaghara m, mana ị ga-echeta ya. Ma Chineke nwere ike ịgbaghara ma chefuo ya. Chee echiche banyere nke ahụ, “echetakwala ya!” Amen. Nke ahụ na-eme ka m nwee obi ụtọ. Mgbe a naghị echeta ya ọzọ, ọ dịghị ihe ga-eme ya ma e wezụga Chineke. Ọ dịghị ihe ọzọ ma e wezụga Chineke nwere ike ime nke ahụ. O kwuru na Ọ ga-ehichapụ ya n’akwụkwọ ncheta Ya. Enweghị m ike ime ya, ị gaghị emeli ya, n’ihi na anyị nwere naanị obere mmetụta ndị a. Ma Ọ bụ Chineke na-enweghị njedebe, Ọ pụrụ ichefu kpamkpam na e meela ya. Amen.
Achịcha Kwa Ụbọchị
Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya site n’ọdịda anyanwụ, otú ahụ ka O wepụrụ mmehie anyị n’ebe anyị nọ.
Abụ Ọma 103:12″