Unu ndị a gbanwere,
Site n’ịpị bọtịnụ ‘kpọọ’ (play), anyị na-ege ntị n’Okwu Chineke nke na-apụghị imehie ihe. Okwu Ya niile bụ Eziokwu, ruo n’ahịrịokwu ọ bụla dị n’ime ya. A kpọrọ anyị ma chekwaa anyị, e jupụtara anyị ma wepụta anyị iche; e jupụtara anyị na Mmụọ Nsọ, ma ugbu a, anyị nọworị n’Ala Kenan. Anyị anaghị atụ egwu ihe ọ bụla… Ọ DỊGHỊ IHE ọ bụla; anyị maara ndị anyị bụ.
N’ihi na anyị nọgidere n’Okwu Ya, dịka O nyere anyị iwu ka anyị mee, Ọ ga-agwa anyị na O hapụụrụ anyị ihe nketa. Olee mgbe I mere nke ahụ, Nna? Mgbe M họọrọ unu ma dee aha unu n’Akwụkwọ Ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ tupu e guzobe ụwa.
Mgbe oge ahụ zuru ezu, M zitere Jizọs, Nwa Atụrụ ahụ, Onye e gburu kemgbe ntọala ụwa, ka unu wee nata ihe nketa unu—ịbụ ụmụ M ndị nwoke na ndị nwanyị, dịka chi ndị na-eto eto.
Ọ dị mkpa ka M lelee unu ma ọ̀ dị ihe na-eme mkpọtụ ma ọ bụ ihe na-adịghị ike n’ime unu tupu M enwee ike idowe unu n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị.
• “Ùnu kwenyere na ọ bụ ihe na-ezighị ezi ịkpọ Olu M site na teepu n’ime ụlọ ụka?”
• “Ee, unu ekwesịghị ịkpọ teepu n’ime ụlọ ụka.”
• “Katọọ ya. Unu na-eme mkpọtụ (adịghị ike).”
• “Ùnu kwenyere na Okwu M dị na teepu chọrọ nkọwa?”
• “Ee, ọ chọrọ onye ga-akọwa ya.”
• “Unu na-eme mkpọtụ. Wepụ ya. Unu akwadobeghị.”
Mgbe unu kwadebere, unu ga-asị, “Amen” n’Okwu ọ bụla.
• “Ùnu kwenyere na M bụ otu Onye ahụ ụnyaahụ, taa, na ruo mgbe ebighị ebi?”
• “Amen.”
• “Ùnu kwenyere na Olu M dị na teepu bụ OLU KACHASỊ MKPA unu kwesịrị ịnụ?”
• “Amen.”
• “Ùnu kwenyere na Olu M dị na teepu ga-eme ka Nwunye ahụ dị n’otu?”
• “Amen.”
• “Ùnu kwenyere na mmụọ ozi M dị ike ga-ewebata unu n’ebe M nọ?”
• “Amen.”
Ugbu a, unu na-esiwanye ike ma kwụsie ike. Enyochala m unu maka ihe ọbụla na-eme mkpọtụ ma ọ bụ ebe na-adịghị ike. Adị m njikere imechi ụzọ ahụ. Aga m etinye Akara m n’ahụ unu. Unu agafeela nnyocha m.
Ugbu a, ka m gwa unu ihe, unu ndị m hụrụ n’anya nke ukwuu, unu ndị nọ n’ebe dị iche iche—ma ọ bụ n’ofe osimiri ma ọ bụ ebe ọbụla unu nọ—unu atụla egwu. Ihe niile dị mma. Amaara m unu tupu e guzobe ntọala ụwa. Amaara m ihe niile ga-eme.
Aga m abịa kpọrọ unu n’oge na-adịghị anya, kpọga unu n’ebe na-enweghị ọnwụ, iru újú, anyaụfụ, ma ọ bụ ihe ọbụla ọjọọ; naanị izu oke na ịhụnanya zuru oke dị n’ebe ahụ.
Ruo mgbe ahụ, echefula ma ọlị—enyeela m unu Okwu m; unu ONWE UNU bụ Okwu m nke ghọrọ anụ ahụ. Ọ bụrụ na unu nwere mkpa maka ihe ọbụla, kwuo ya, ma kwere na ọ ga-emezu; ọ bụ ihe nketa unu.
Aga m ezitere unu Olu m ọzọ n’ụbọchị Sọnde a, ma kọwaara unu ihe niile. Aga m agwa unu ọzọ onye unu bụ, ebe unu na-aga, na otú ọnọdụ dị n’ebe ahụ ugbu a.
Bịanụ sonyere Nwunye m, ka ha na-anọkọ ọnụ n’ebe dị n’eluigwe n’ụbọchị Sọnde a, n’elekere iri na abụọ nke ehihie (12:00 P.M.)—dịka oge Jeffersonville si dị—ma nụ ka m si jiri Okwu m dozie unu n’ọnọdụ kwesịrị ekwesị. 60-0522E NKUCHI #4 (Adoption) #4
Nwanna Joseph Branham